1 Chronicles 6

Ụmụ ụmụ Livayị

1Livayị mụrụ ndị a:
Geshọn, Kohat na Merari.
2Kohat mụrụ
Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.
3Amram mụrụ
Erọn, Mosis na Miriam.
Erọn mụrụ
Nadab, Abihu, Elieza na Itama.
4Elieza mụrụ Finehaz;
Finehaz abụrụ nna Abishua
5Abishua bụ nna Buki,
Buki abụrụ nna Uzi.
6Uzi mụrụ Zerahaya,
Zerahaya amụọ Meraiot.
7Meraiot mụrụ Amaraya,
Amaraya amụọ Ahitub.
8Ahitub mụrụ Zadọk,
Zadọk amụọ Ahimaaz.
9Ahimaaz mụrụ Azaraya,
Azaraya amụọ Johanan.
10Johanan mụrụ Azaraya
ọ bụ ya bụ onye ahụ bụ onye nchụaja ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru na Jerusalem.
11Azaraya mụrụ Amaraya,
Amaraya amụọ Ahitub.
12Ahitub mụrụ Zadọk,
Zadọk amụọ Shalum.
13Shalum mụrụ Hilkaya,
Hilkaya amụọ Azaraya.
14Azaraya mụrụ Seraya,
Seraya amụọ Jehozadak,
15A dọtara Jehozadak nʼagha mgbe Onyenwe anyị mere ka Nebukadneza dọkpụrụ ndị Juda na Jerusalem nʼagha.

16Ụmụ ndị ikom Livayị bụ,
Geshọm, Kohat na Merari.
17Geshọm mụrụ
Libni na Shimei.
18Ụmụ Kohat bụ
Amram, Izha, Hebrọn, na Uziel.
19Merari mụtara
Mahali na Mushi.

Ndị a bụ ikwu Livayị ndị e depụtara dịka aha nna ha si dị.
20Ikwu Geshọm bụ
Libni, Jahat,
Zima,
21Joa,
Ido, Zera
na Jeaterai.
22Ikwu Kohat bụ
Aminadab, Kora,
Asịa,
23Elkena,
Ebiasaf, Asịa,
24Tahat, Uriel,
Ụzaya na Shaul.
25Ụmụ ụmụ Elkena bụ
Amasai na Ahimot.
26Ụmụ ụmụ Ahimot bụ
Elkena, Zofai, Nahat,
27Eliab,
Jeroham, Elkena
na Samuel.
28Ụmụ Samuel bụ
Juel, ọkpara ya,
na Abija nke abụọ.
29Ụmụ ụmụ Merari bụ
Mahali, Libni,
Shimei, Ụza,
30Shimea, Hagiya
na Asaya.

Ndị na-abụ abụ nʼụlọnsọ ukwu

31Ndị a bụ ndị ikom Devid họpụtara nye ọrụ ilekọta ndị ọbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ nʼebe ahụ. 32Ha jere ozi ịbụ abụ ha nʼihu ụlọ ikwu, ya bụ, ụlọ nzute, tutu ruo mgbe Solomọn wuchara ụlọnsọ Onyenwe anyị na Jerusalem. Ha jere ozi ha dịka usoro ije ozi ha si dị.

33Ndị a bụ ndị ikom ahụ jere ozi, ha na ụmụ ha ndị ikom:

Site nʼikwu Kohat:
Heman, ọbụ abụ.
Ndị a bụ nna nna ya ochie: Juel, nwa Samuel,
34nwa Elkena, nwa Jeroham,
nwa Eliel, nwa Toa,
35nwa Zuf, nwa Elkena,
nwa Mahat, nwa Amasai,
36nwa Elkena, nwa Juel,
nwa Azaraya, nwa Zefanaya,
37nwa Tahat, nwa Asịa,
nwa Ebiasaf, nwa Kora,
38nwa Izha, nwa Kohat,
nwa Livayị, nwa Izrel.
39Asaf onye na-enyere Heman aka, na-eje ozi nʼakụkụ aka nri ya.
Ndị bụ nna nna ya ochie bụ ndị a: Berekaya, nwa Shimea,
40nwa Maikel, nwa Baaseya,
nwa Malkija,
41nwa Etni,
nwa Zera, nwa Adaya,
42nwa Etan, nwa Zima,
nwa Shimei,
43nwa Jahat,
nwa Geshọm, nwa Livayị.
44Onye ọzọ na-enyere Heman aka bụ Etan, onye ikwu Merari. Ọ na-anọ nʼaka ekpe ya.
Ndị bụ nna nna ochie Etan bụ ndị a, Kishi, nwa Abdi,
nwa Maluk,
45nwa Hashabaya,
nwa Amazaya, nwa Hilkaya,
46nwa Amzi, nwa Bani,
nwa Shema,
47nwa Mahali,
nwa Mushi, nwa Merari,
nwa Livayị.

48Ụmụnna ha ndị Livayị ụfọdụ ka e tinyere nʼọrụ dị iche iche nʼụlọ ikwu, bụ ụlọ Chineke. 49Ma Erọn na ụmụ ụmụ ya bụ ndị chụrụ aja onyinye nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nakwa nʼelu ebe ịchụ aja ihe na-esi isi ụtọ, nke metụtara ọrụ ije ozi niile nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, na-ekpuchikwara Izrel mmehie niile ha, nʼusoro dịka ihe niile si dị nke Mosis ohu Chineke nyere nʼiwu.

50Ụmụ ụmụ Erọn bụ
Elieza, na Finehaz,
na Abishua,
51na Buki,
na Uzi, na Zerahaya,
52na Meraiot, na Amaraya,
na Ahitub,
53na Zadọk,
na Ahimaaz.

54Ndị a bụ ala na obodo dị iche iche ụmụ Erọn ketara, nke e nyere ikwu Kohat, ụmụ ụmụ Erọn, nʼihi na ọ bụ ha ka e bu ụzọ kenye oke site nʼife nza.
55Hebrọn, nʼime Juda, ya na ala ịta nri anụ ụlọ niile dị ya gburugburu. 56Ma ala ubi na obodo nta niile gbara Hebrọn gburugburu ka e nyere Kaleb nwa Jefune. 57Ya mere e nyere ụmụ ụmụ Erọn Hebrọn (obodo mgbaba), na Libna, na Jatịa, na Eshtemoa, 58na Hilen, na Debịa, 59na Ashan, na Juta, na Bet-Shemesh, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
60Site nʼebo Benjamin e nyere ha obodo Gibiọn, Geba, Alemet, na Anatot, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
Obodo ndị a, nke e kere nʼetiti ndị ikwu Kohat, dị iri na otu nʼọnụọgụgụ.

61E fere nza tupu e nye ndị fọdụrụ nʼime ikwu Kohat obodo iri site nʼala ọkara ebo Manase.
62E fekwara nza nye agbụrụ niile dị nʼikwu Geshọm obodo iri na atọ na Bashan, site nʼala ebo Isaka, na Asha, na Naftalị, na agbụrụ niile dị nʼikwu Manase.
63E fekwara nza nye ikwu Merari obodo iri na abụọ site nʼala ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.

64Otu a ka ndị Izrel si nye ndị Livayị obodo ndị a na ebe ịta nri nke anụ ụlọ dị.

65Site nʼebo Juda, na Simiọn, na Benjamin ka e si kenye ha obodo ndị ahụ a kpọrọ aha ha na mbụ.

66E sitere nʼala ndị ebo Ifrem kenye ụfọdụ nʼime ndị agbụrụ Kohat obodo ụfọdụ.
67Nʼala ugwu ugwu Ifrem e kenyere ha Shekem (obodo mgbaba), na Gaza, 68na Jokmeam, na Bet-Horon, 69na Aijalon, na, Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara ya gburugburu.
70Site nʼọkara ebo Manase, ndị Izrel nyere ndị ikwu Kohat fọdụrụ obodo ndị a: Anea na Bileam, tinyere ala ebe ịta nri anụ ụlọ ha.

71Ndị Geshọm natara obodo ndị a:
Site nʼagbụrụ ọkara ebo Manase ha natara Golan, nke dị na Bashan, na Ashtarọt, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
72Ebo Isaka nyere ha Kedesh, Daberat, 73Ramọt na Anem, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ niile dị ha gburugburu.
74Ebo Asha nyere ha Mashal, Abdon, 75Hukọk na Rehob, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ niile dị ha gburugburu.
76Ebo Naftalị nyere ha Kedesh nʼime Galili, Hamọn na Kiriatem, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.

77Ndị ebo Zebụlọn nyere ụmụ Merari ndị Livayị fọdụrụ ala ndị a:
Jokneam, Kata, Rimọn na Taboa, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ ha.
78Ma nʼofe osimiri Jọdan, nʼọwụwa anyanwụ obodo Jeriko, ndị ebo Ruben nyere ha obodo Beza dị nʼọzara, nyekwa ha Jahaz, 79Kedemot na Mefaat, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha niile.
80Ndị ebo Gad nyere ha Ramọt nke Gilead, Mahanaim, 81Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha niile.
Copyright information for IboBIU